Zekaraya 5

Asịrị m, “Gịnị ka ọ bụ?” Ọ sịrị, “Ọ bụ nkata.” O kwukwara, “Nke a bụ mmehie nke ndị niile bi nʼala a.”

Zechariah 5:6 (UKJV) And I said, What is it? And he said, This is an ephah that goes forth. He said moreover, This is their resemblance through all the earth.

4Ezipụla m ya, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri, ‘Ọ ga-abanye nʼụlọ onye ọ bụla na-ezu ohi, na nʼụlọ ndị ji aha m na-aṅụ iyi ụgha. Ọ ga-anọgide nʼụlọ ahụ mebie ya kpamkpam. Ọ ga-emebi osisi na nkume niile e ji wuo ụlọ ahụ.’ ”

5Mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu bịakwutere m sị, “Lelie anya gị elu hụrụ ihe na-aga ịpụta ìhè.”

6Asịrị m, “Gịnị ka ọ bụ?” Ọ sịrị, “Ọ bụ nkata.” O kwukwara, “Nke a bụ mmehie nke ndị niile bi nʼala a.”

7Ngwangwa, e kpughepụrụ okwuchi nkata ahụ, ma lee, ahụrụ m otu nwanyị nọdụrụ ọdụ nʼime ya.

8Ọ sịrị, “Nke a bụ ajọ omume.” O nughachiri ya azụ nʼime nkata ahụ werekwa okwuchi nkata ahụ kpuchie ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.