1Elelikwara m anya elu ọzọ hụ ụgbọ ịnyịnya anọ nke si nʼetiti ugwu abụọ na-apụta. Ugwu ndị a bụ ugwu e ji bronz mee.
2Ụgbọ ịnyịnya nke mbụ ka ịnyịnya na-acha ọbara ọbara na-adọkpụ. Nke abụọ ka ịnyịnya na-eji nji na-adọkpụ.
3Nke atọ ka ịnyịnya dị ọcha na-adọkpụ, ma nke anọ ka ịnyịnya tụrụ agwa siekwa ike na-adọkpụ.
4Ajụrụ m mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu, “Gịnị ka ihe ndị a bụ, nna m ukwu?”
5Mmụọ ozi ahụ zara m, sị, “Ndị a bụ mmụọ anọ nke eluigwe, ka ha na-apụ mgbe ha guzochara nʼihu Onyenwe elu ụwa niile.