Zekaraya 8

Ọtụtụ ndị mmadụ na ọtụtụ mba dị ike ga-abịa Jerusalem ịchọ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na ịrịọ ya arịrịọ.”

Zechariah 8:22 (UKJV) Yea, many people and strong nations shall come to seek the LORD of hosts in Jerusalem, and to pray before the LORD.

20Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ekwukwa: “Ndị dị iche iche na ndị bi nʼọtụtụ obodo dị iche iche ka ga-abịa.

21Ndị bi nʼotu obodo ga-ejekwa nʼobodo ọzọ, sị, ‘Ka anyị jee na-atụfughị oge gaa rịọọ Onyenwe anyị arịrịọ, ka anyị chọọnụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. Mụ onwe m na-ejekwa.’

22Ọtụtụ ndị mmadụ na ọtụtụ mba dị ike ga-abịa Jerusalem ịchọ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na ịrịọ ya arịrịọ.”

23Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Nʼụbọchị ndị ahụ, mmadụ iri, ndị ga-esi na mba dị iche iche, ndị na-asụkwa asụsụ dị iche iche, ga-ejide otu onye Juda aka nʼọnụ ọnụ uwe ya na-asị, ‘Kwere ka anyị soro gị jee, nʼihi na anyị anụla na Chineke nọnyeere unu.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.