1Okwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ruru m ntị na-asị,
2Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: “Ana m ekwo ekworo dị ukwuu nʼihi Zayọn. Nʼezie, ekworo ahụ na-anụ m ọkụ dị ukwuu nʼahụ.”
3Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Aga m alọghachi na Zayọn, bịa biri na Jerusalem. Mgbe ahụ, a ga-akpọ Jerusalem, obodo Eziokwu. A ga-akpọkwa ugwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile Ugwu Nsọ.”
4Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Agadi ndị ikom na agadi ndị inyom ga-anọdụkwa ala ọzọ na mbara ụzọ niile nke Jerusalem, onye ọbụla ga-ejidekwa mkpara nʼaka ya nʼihi ọnụọgụgụ afọ ha gbara.
5Okporoụzọ nke obodo ahụ niile ga-ejupụtakwa nʼụmụntakịrị ndị nwoke na ndị nwanyị na-egwugharị egwu na ama ebe ahụ.”