5Okporoụzọ nke obodo ahụ niile ga-ejupụtakwa nʼụmụntakịrị ndị nwoke na ndị nwanyị na-egwugharị egwu na ama ebe ahụ.”
6Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “O nwere ike bụrụ na ihe ndị a ga-adị ka ihe dịkarịrị ike imezu nʼanya ndị ahụ ga-afọdụ nʼoge ahụ, ma ọ ga-abụ ihe dịkarịrị ike ime nʼanya m?” Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.
7Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Aga m azọpụta ndị m site na mba niile dị nʼọwụwa anyanwụ na nʼọdịda anyanwụ.
8Aga m akpọghachitekwa ha, mee ka ha biri na Jerusalem. Ha ga-abụkwa ndị m, mụ onwe m ga-abụ Chineke ha, onye ezi omume na onye kwesiri ntụkwasị obi.”
9Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: “Ka aka unu sie ike, ka enwe ike wuo ụlọnsọ a, unu ndị na-anụ ugbu a otu okwu ahụ, nke ndị amụma kwuru mgbe a tọrọ ntọala iwugharị ụlọnsọ m, bụ ụlọ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.