2Otu ahụkwa ka ọ dị Hamat, nke dị ya nso; tinyekwara Taịa na Saịdọn, ọ bụ ezie na ha bụ ndị maara ihe nke ukwu.
3Taịa ewuolara onwe ya ebe e wusiri ike, tụkọba ọlaọcha dịka aja, na ọlaedo dịka uzuzu nke okporoụzọ.
4Ma Onyenwe anyị ga-anapụ ya ihe niile o nwere ọ ga-atụnye ike ya nʼoke osimiri, ọ ga-ejikwa ọkụ repịa ya.
5Ashkelọn ga-ejupụta nʼụjọ mgbe ọ ga-ahụ ihe ndị a ka ha na-eme. Gaza kwa, ga-aṅagharị onwe ya nʼime oke ihe mgbu. Ọ bụladị Ekrọn ga-ama jijiji nʼụjọ mgbe ha hụrụ na olileanya ha agwụla. A ga-anapụ Gaza eze ya ma gbukwaa ya. Ọ dịghị onye ọbụla ga-ebikwa nʼAshkelọn.
6Ụmụ amụtara nʼịkwa iko ga-ebichi obodo Ashdọd, aga m emekwa ka mpako ndị Filistia ndị a kwụsị.