Zekaraya 9

Otu ahụkwa ka ọ dị Hamat, nke dị ya nso; tinyekwara Taịa na Saịdọn, ọ bụ ezie na ha bụ ndị maara ihe nke ukwu.

Zechariah 9:2 (UKJV) And Hamath also shall border thereby; Tyrus, and Zidon, though it be very wise.

1Okwu Amụma. Nke a bụ okwu Onyenwe anyị megide ala Hadrak, na obodo Damaskọs ka ọ ga-ezukwa ike, nʼihi nʼebe Onyenwe anyị nọ ka anya mmadụ niile na ebo niile nke Izrel dị.

2Otu ahụkwa ka ọ dị Hamat, nke dị ya nso; tinyekwara Taịa na Saịdọn, ọ bụ ezie na ha bụ ndị maara ihe nke ukwu.

3Taịa ewuolara onwe ya ebe e wusiri ike, tụkọba ọlaọcha dịka aja, na ọlaedo dịka uzuzu nke okporoụzọ.

4Ma Onyenwe anyị ga-anapụ ya ihe niile o nwere ọ ga-atụnye ike ya nʼoke osimiri, ọ ga-ejikwa ọkụ repịa ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.