8“Nʼụbọchị ịchụ aja nke Onyenwe anyị ahụ, aga m ata ndịisi niile na ụmụ eze niile, na ndị niile na-eyi uwe e si na mba ọzọ bubata ahụhụ.
9Nʼụbọchị ahụ, aga m ata ha ahụhụ bụ ndị niile na-adịghị azọ ụkwụ nʼọnụ ụzọ mbata, ndị ji ihe ike na aghụghọ na-emejupụta ụlọ arụsị ha.
10“Nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya, “olu iti mkpu akwa ga-esite nʼỌnụ Ụzọ Ama Azụ daa, mkpu nke ịkwasi akwa ike ga-ada site nʼebe obibi ọhụrụ ahụ, na ụzụ oke ntiwa site nʼugwu nta niile.
11Kwasienụ akwa ike unu ndị niile bi nʼakụkụ ebe ahịa dị; nʼihi na a ga-egbuchapụ ndị ahịa unu niile. Ndị niile na-eji ọlaọcha azụ ahịa ka a ga-ebibi.
12Nʼoge ahụ, aga m eji oriọna nyobanyechaa anya nʼakụkụ niile nke Jerusalem. Aga m ata ndị ahụ niile na-anọ nʼahụ dị jụụ ahụhụ, bụ ndị ahụ dọọrọ dịka ike mmanya a ṅụfọdụrụ aṅụfọ, ndị na-eche nʼobi ha sị, ‘O nweghị ihe Onyenwe anyị ga-eme anyị, maọbụ ihe ọma, maọbụ ihe ọjọọ.’