Zefanaya 1

Akụ ha ga-abụ ihe a kwakọrọ nʼike, a ga-akwatukwa ụlọ ha niile. Ọ bụ ezie na ha ga-ewu ụlọ, ma ha agaghị ebi nʼime ha; ọ bụ ezie na ha ga-akọ ubi vaịnị, ma ha agaghị aṅụ mmanya si na ha.”

Zephaniah 1:13 (UKJV) Therefore their goods shall become a booty, and their houses a desolation: they shall also build houses, but not inhabit them; and they shall plant vineyards, but not drink the wine thereof.

11Kwasienụ akwa ike unu ndị niile bi nʼakụkụ ebe ahịa dị; nʼihi na a ga-egbuchapụ ndị ahịa unu niile. Ndị niile na-eji ọlaọcha azụ ahịa ka a ga-ebibi.

12Nʼoge ahụ, aga m eji oriọna nyobanyechaa anya nʼakụkụ niile nke Jerusalem. Aga m ata ndị ahụ niile na-anọ nʼahụ dị jụụ ahụhụ, bụ ndị ahụ dọọrọ dịka ike mmanya a ṅụfọdụrụ aṅụfọ, ndị na-eche nʼobi ha sị, ‘O nweghị ihe Onyenwe anyị ga-eme anyị, maọbụ ihe ọma, maọbụ ihe ọjọọ.’

13Akụ ha ga-abụ ihe a kwakọrọ nʼike, a ga-akwatukwa ụlọ ha niile. Ọ bụ ezie na ha ga-ewu ụlọ, ma ha agaghị ebi nʼime ha; ọ bụ ezie na ha ga-akọ ubi vaịnị, ma ha agaghị aṅụ mmanya si na ha.”

14Oke ụbọchị Onyenwe anyị na-abịa nso, ọ na-abịakwa ọsịịsọ. Gee ntị! Iti mkpu akwa nke ụbọchị Onyenwe anyị ga-adị ilu nke ukwuu. A ga-anụkwa ụzụ ndị bụ dike nʼagha nʼebe ahụ.

15Ụbọchị ahụ ga-abụ ụbọchị ọnụma, ụbọchị ahụhụ na mkpagbu, ụbọchị nsogbu na mbibi, ụbọchị ọchịchịrị na oke obi ọjọọ, ụbọchị igwe ojii, na oke ọchịchịrị,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.