1Okwu Onyenwe anyị nke rutere Zefanaya, nwa Kushi, nwa nwa Gedaliya, bụ nwa Amaraya. Amaraya bụ nwa Hezekaya. Ozi a bịara nʼoge Josaya nwa Amọn, bụ eze Juda.
2“Aga m azachapụ ihe niile site nʼelu ụwa,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
3“Aga m azachapụ mmadụ na anụmanụ. Aga m azachapụ ụmụ anụ ufe niile nke dị nʼeluigwe, zachapụkwa azụ niile nke dị nʼosimiri, na arụsị niile dị iche iche nke na-eme ka ndị ajọ mmadụ sụọ ngọngọ.” “Mgbe m kpochapụrụ mmadụ niile site nʼelu ụwa,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
4“Aga m esetipụ aka m megide Juda, megidekwa ndị niile bi na Jerusalem. Aga m ebipụkwa ndị niile na-efe Baal fọdụrụ nʼebe a, na aha ndị nchụaja arụsị niile, ma ndị nchụaja niile na-ekpere arụsị,