6Ala nke dị nʼakụkụ oke osimiri ahụ, ga-aghọ ebe ahịhịa jupụtara nye ndị ọzụzụ atụrụ na ọgba igwe ewu na atụrụ.
7Ala nke dị nʼakụkụ oke osimiri ga-aghọ ala nke ndị ahụ fọdụrụ na Juda, ebe ha ga-achọtara anụ ụlọ ha ahịhịa. Ha ga-anọkwa nʼụlọ ndị Ashkelọn nke tọgbọrọ nʼefu, dinaa ala zuru ike nʼoge uhuruchi. Onyenwe anyị Chineke ha ga-elekọta ha, mekwaa ka ha nwetaghachi ihe nketa ha niile.
8“Anụla m okwu ọjọọ niile, nke ndị Moab, na ịkwa emo niile nke ndị Amọn, nụkwa ịbasị mba ike ha megide ndị nke m na-anya isi na ha ga-ewere ala ha.
9Nʼihi ya, dịka m na-adị ndụ,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwubiri ya, “aghaghị m ime ka Moab dịrị ka Sọdọm, mekwaa ka Amọn dịka Gọmọra. Ha ga-aghọ ala ebe ahịhịa na-adụ ogwu ogwu na-eru, ebe olulu nnu jupụtara, na ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi. Ndị m, ndị fọdụrụ ga-akwakọrọ akụnụba ha, ndị fọdụrụ ndụ na mba m ga-eketa ala ha.”
10Ihe ndị a bụ ụgwọ ọrụ ha ga-anata nʼihi ịnya isi ha, na nʼihi nkọcha na ịkwa emo ha megide ndị nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.