1Ahụhụ dịrị obodo ahụ ndị mmegbu, na ndị na-enupu isi, na ndị rụrụ arụ jupụtara nʼime ya.
2Ọ naghị ege onye ọbụla ntị, ọ dịghị anabata ịdọ aka na ntị. Ọ dịghị atụkwasị Onyenwe anyị obi, ọ dịkwaghị abịakwute Chineke ya nso.
3Ndịisi nọ nʼetiti ya dịka ọdụm na-agbọ ụja, ndị ọkaikpe ya dịka nkịta ọhịa na-achụ nta anyasị, nke ihe ọ chụtara na nta adịghị anọ tutu chi abọọ.