1 Ihe E Mere 12

Ọ bụ ha gafere osimiri Jọdan nʼudu mmiri, mgbe Jọdan tofere akụkụ ya niile, chụsaa ndị niile bi na ndagwurugwu, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ.

1 Chronicles 12:15 (UKJV) These are they that went over Jordan in the first month, when it had overflowed all his banks; and they put to flight all them of the valleys, both toward the east, and toward the west.

13na Jeremaya onye nke iri, nakwa Makbanai onye nke iri nʼotu.

14Ndị a, ndị sitere nʼebo Gad bụ ndịisi agha. Onye na-adịghị ike nʼime ha dị ike dịka narị ndị agha, ma onye dị ike nʼime ha dị ike dịka puku ndị agha.

15Ọ bụ ha gafere osimiri Jọdan nʼudu mmiri, mgbe Jọdan tofere akụkụ ya niile, chụsaa ndị niile bi na ndagwurugwu, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ.

16Ndị ọzọ sitekwara nʼebo Benjamin na Juda bịakwute Devid nʼebe ya e wusiri ike.

17Mgbe ahụ, Devid pụrụ ịga zute ha, sị ha, “Ọ bụrụ na unu bịara nʼudo inyere m aka, ejikeere m ịnabata unu ka unu dịnyere m. Kama ọ bụrụkwanụ na unu bịara ịrara m nye nʼaka ndị iro m, ebe aka m dị ọcha, ka Chineke nna nna anyị hụ ihe dị unu nʼobi kpee unu ikpe.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.