1 Ihe E Mere 12

Mgbe ahụ, Mmụọ Nsọ dakwasịrị Amasai, onyendu iri ndị ikom atọ ahụ, mee ka ọ gwa Devid okwu sị ya, “Anyị bụ ndị gị, Devid! Anyị so gị nʼazụ, gị nwa Jesi! Udo, udo ga-abụ nke gị, udo ga-abụkwa nke ndị na-enyere gị aka, nʼihi na Chineke gị na-enyere gị aka.” Ya mere, Devid nabatara ha mee ha ndịisi agha na-apụnara ndị mmadụ ihe.

1 Chronicles 12:18 (UKJV) Then the spirit came upon Amasai, who was chief of the captains, and he said, Yours are we, David, and on your side, you son of Jesse: peace, peace be unto you, and peace be to yours helpers; for your God helps you. Then David received them, and made them captains of the band.

16Ndị ọzọ sitekwara nʼebo Benjamin na Juda bịakwute Devid nʼebe ya e wusiri ike.

17Mgbe ahụ, Devid pụrụ ịga zute ha, sị ha, “Ọ bụrụ na unu bịara nʼudo inyere m aka, ejikeere m ịnabata unu ka unu dịnyere m. Kama ọ bụrụkwanụ na unu bịara ịrara m nye nʼaka ndị iro m, ebe aka m dị ọcha, ka Chineke nna nna anyị hụ ihe dị unu nʼobi kpee unu ikpe.”

18Mgbe ahụ, Mmụọ Nsọ dakwasịrị Amasai, onyendu iri ndị ikom atọ ahụ, mee ka ọ gwa Devid okwu sị ya, “Anyị bụ ndị gị, Devid! Anyị so gị nʼazụ, gị nwa Jesi! Udo, udo ga-abụ nke gị, udo ga-abụkwa nke ndị na-enyere gị aka, nʼihi na Chineke gị na-enyere gị aka.” Ya mere, Devid nabatara ha mee ha ndịisi agha na-apụnara ndị mmadụ ihe.

19Ụfọdụ nʼime ndị ebo Manase gbasooro Devid, mgbe ọ gara sonyere ndị Filistia nʼịlụso Sọl ọgụ. Ma ya na ndị agha ya enyereghị ndị Filistia aka, nʼihi na mgbe ndị Filistia gbachara izu, ndị ndu ndị Filistia zilagara ya. Ha kwuru sị, “Isi anyị ka anyị ga-atụfu ma ọ bụrụ na Devid ahapụ anyị nʼọgbọ agha gbakwuru nna ya ukwu bụ Sọl.”

20Mgbe Devid gara Ziklag, ndị a bụ ndị ikom si nʼebo Manase ndị gbasooro ya: Adna, Jozabad, Jediael, Maikel, Jozabad, Elihu na Ziletai. Ndị a niile bụ ndịisi agha na-achị puku ndị agha nʼebo Manase.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.