1 Ihe E Mere 12

Ndị a bụ ndị jikeere ibu agha, ndị chịkwa ngwa agha bịakwute Devid na Hebrọn, nʼihi na ha chọrọ ka ọ bịa bụrụ eze ha nʼọnọdụ Sọl, dịka Onyenwe anyị kwuru.

1 Chronicles 12:23 (UKJV) And these are the numbers of the bands that were ready armed to the war, and came to David to Hebron, to turn the kingdom of Saul to him, according to the word of the LORD.

21Ha nyeere Devid aka imegide ndị agha nkwata ahụ, nʼihi na ha niile bụ dike nʼagha, bụrụkwa ndịisi agha.

22Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, ọtụtụ ndị ikom na-agbafeta soro Devid, tutu ruo mgbe ha ghọrọ igwe ndị agha, ndị agha nke Chineke.

23Ndị a bụ ndị jikeere ibu agha, ndị chịkwa ngwa agha bịakwute Devid na Hebrọn, nʼihi na ha chọrọ ka ọ bịa bụrụ eze ha nʼọnọdụ Sọl, dịka Onyenwe anyị kwuru.

24Ndị sitere nʼebo Juda, ndị bu ọta na ùbe ha dị puku isii na narị asatọ. (6,800)

25Ndị Simiọn a maara aha ha nʼibu agha dị puku asaa na otu narị. (7,100)

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.