1 Ihe E Mere 12

Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, ọtụtụ ndị ikom na-agbafeta soro Devid, tutu ruo mgbe ha ghọrọ igwe ndị agha, ndị agha nke Chineke.

1 Chronicles 12:22 (UKJV) For at that time day by day there came to David to help him, until it was a great host, like the host of God.

20Mgbe Devid gara Ziklag, ndị a bụ ndị ikom si nʼebo Manase ndị gbasooro ya: Adna, Jozabad, Jediael, Maikel, Jozabad, Elihu na Ziletai. Ndị a niile bụ ndịisi agha na-achị puku ndị agha nʼebo Manase.

21Ha nyeere Devid aka imegide ndị agha nkwata ahụ, nʼihi na ha niile bụ dike nʼagha, bụrụkwa ndịisi agha.

22Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, ọtụtụ ndị ikom na-agbafeta soro Devid, tutu ruo mgbe ha ghọrọ igwe ndị agha, ndị agha nke Chineke.

23Ndị a bụ ndị jikeere ibu agha, ndị chịkwa ngwa agha bịakwute Devid na Hebrọn, nʼihi na ha chọrọ ka ọ bịa bụrụ eze ha nʼọnọdụ Sọl, dịka Onyenwe anyị kwuru.

24Ndị sitere nʼebo Juda, ndị bu ọta na ùbe ha dị puku isii na narị asatọ. (6,800)

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.