1Ndị a bụ ndị ikom bịakwutere Devid na Ziklag, mgbe e si nʼihu Sọl nwa Kish chụpụ ya. (Ha so nʼime ndị ọka agha nyeere Devid aka ibu agha.
2Ngwa agha ha bụ ụta, ha nwere ike iji aka nri maọbụ aka ekpe gbapụ àkụ maọbụ fee ebe; ndị a bụ ndị ikwu Sọl si nʼebo Benjamin.)
3Onyeisi ha bụ Ahieza na Joash, bụ ụmụ Shema onye Gibea. Ndị ọzọ bụ, Jeziel na Pelet ụmụ Azmavet, Beraka, Jehu onye Anatot,
4Ishmaya onye Gibiọn, dimkpa nʼetiti iri mmadụ atọ ndị ahụ, onye bụ onyendu iri mmadụ atọ ahụ, Jeremaya, Jahaziel, Johanan, Jozabad onye Gedera,
5Eluzai, Jerimot, Bealia, Shemaraya, na Shefataya onye Haruf;