1 Ihe E Mere 13

Ma iwe Onyenwe anyị dị ọkụ megide Ụza, o tigburu ya nʼihi na o metụrụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ aka. Ya mere, ọ nwụrụ nʼebe ahụ nʼihu Chineke.

1 Chronicles 13:10 (UKJV) And the anger of the LORD was kindled against Uzza, and he stroke him, because he put his hand to the ark: and there he died before God.

8Devid na ndị Izrel niile weere ike ha niile na-aṅụ ọṅụ nʼihu Chineke, jiri abụ, ụbọ akwara, opi, une na ogene na iti egwu na-etekwa egwu.

9Mgbe ha rutere nʼebe ịzọcha ọka nke Kidon, Ụza setịpụrụ aka ya ijide igbe ọgbụgba ndụ ahụ, nʼihi na ehi ahụ zọhiere ụkwụ.

10Ma iwe Onyenwe anyị dị ọkụ megide Ụza, o tigburu ya nʼihi na o metụrụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ aka. Ya mere, ọ nwụrụ nʼebe ahụ nʼihu Chineke.

11Mgbe ahụ, iwe were Devid nʼihi ọnụma Onyenwe anyị dakwasịrị Ụza, ruo taa, a na-akpọ ebe ahụ Perez Ụza.

12Devid tụrụ egwu Chineke nʼụbọchị ahụ, o kwuru sị, “M ga-esi aṅaa bubatara onwe m igbe ọgbụgba ndụ a?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.