1Devid na ndịisi agha ya na-achị imerime puku ndị agha, na ọtụtụ narị ndị agha, zukọrọ gbaa izu.
2Ọ gwara ọgbakọ Izrel niile ahụ sị, “Ọ bụrụ na ọ dị unu mma, ọ bụrụkwa na ọ bụ ọchịchọ Onyenwe anyị Chineke anyị, ka anyị ziga ozi zie ụmụnna anyị niile bi nʼakụkụ niile nke ala Izrel, na ndị nchụaja na ndị Livayị niile, bi nʼobodo ha na ndị bi nʼebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, ka ha bịa, soro anyị.
3Ka anyị gaa bulata igbe ọgbụgba ndụ Chineke nʼihi na e lefuru ya anya nʼoge ahụ niile Sọl bụ eze.”
4Ha niile kwekọrịtara ime nke a nʼihi na okwu ahụ dị ndị niile zukọrọ mma.