1 Ihe E Mere 13

Ha niile kwekọrịtara ime nke a nʼihi na okwu ahụ dị ndị niile zukọrọ mma.

1 Chronicles 13:4 (UKJV) And all the congregation said that they would do so: for the thing was right in the eyes of all the people.

2Ọ gwara ọgbakọ Izrel niile ahụ sị, “Ọ bụrụ na ọ dị unu mma, ọ bụrụkwa na ọ bụ ọchịchọ Onyenwe anyị Chineke anyị, ka anyị ziga ozi zie ụmụnna anyị niile bi nʼakụkụ niile nke ala Izrel, na ndị nchụaja na ndị Livayị niile, bi nʼobodo ha na ndị bi nʼebe ịta nri nke anụ ụlọ ha, ka ha bịa, soro anyị.

3Ka anyị gaa bulata igbe ọgbụgba ndụ Chineke nʼihi na e lefuru ya anya nʼoge ahụ niile Sọl bụ eze.”

4Ha niile kwekọrịtara ime nke a nʼihi na okwu ahụ dị ndị niile zukọrọ mma.

5Mgbe ahụ, Devid kpọrọ ndị Izrel niile oku ka ha zuo ezuo site nʼebe niile ha bi, site nʼoke ala ha na ndị Ijipt, ya bụ iyi Shiho, ruo nʼoke ala dị nʼugwu, ya bụ Lebo Hamat, ka ha gaa bulata igbe ọgbụgba ndụ Chineke site na Kiriat Jearim.

6Devid na ndị Izrel niile jere Baala nʼime Juda, ya bụ Kiriat Jearim, i si nʼebe ahụ bugota igbe ọgbụgba ndụ Chineke, bụ Onyenwe anyị, onye na-anọkwasị nʼetiti cherubim, igbe ahụ nke akpọkwasịrị aha ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.