30Maa jijiji nʼihu ya, unu ụwa niile. Elu ụwa niile kwụ chịm, a pụghị iwezuga ya nʼọnọdụ ya.
31Ka eluigwe ṅụrịa, ka ụwa nwekwa obi ụtọ; ka ha kwupụta nʼetiti mba niile sị, “Onyenwe anyị na-achị.”
32Ka osimiri bigbọọ, na ihe niile dị nʼime ya, ka ala ubi niile na ihe niile dị nʼime ha jupụta nʼobi ụtọ.
33Ka osisi niile nke oke ọhịa bụọ abụ, ka ha bụọ abụ ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe.
34Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.