32Ka osimiri bigbọọ, na ihe niile dị nʼime ya, ka ala ubi niile na ihe niile dị nʼime ha jupụta nʼobi ụtọ.
33Ka osisi niile nke oke ọhịa bụọ abụ, ka ha bụọ abụ ọṅụ nʼihu Onyenwe anyị, nʼihi na ọ na-abịa ikpe ụwa ikpe.
34Keleenụ Onyenwe anyị, nʼihi na ọ dị mma, nʼihi na ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
35Tikuonụ ya mkpu sị, “Zọpụta anyị, gị Chineke, Onye nzọpụta anyị; chịkọta anyị, ma napụtakwa anyị site nʼaka mba dị iche iche, ka anyị nwee ike nye aha nsọ gị ekele; ma nyaakwa isi nʼime otuto gị.”
36Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. Mgbe ahụ, mmadụ niile sịrị, “Amen” na “Toonu Onyenwe anyị.”