16Mgbe ahụ, eze Devid banyere nọdụ ala nʼihu Onyenwe anyị, sị: “Onye ka m bụ, Onyenwe anyị Chineke, gịnịkwa ka ezinaụlọ m bụ, na ị mere ka m bịaruo nʼogogo ha otu a?
17O Chineke m, dịka a ga-asị na nke a bụ ihe dị nta nʼanya gị, ugbu a, i kwuola banyere ọdịnihu nke ụlọ ohu gị. Ma gị onwe gị Onyenwe anyị Chineke na-ele m anya dịka a ga-asị na m bụ onye ọnọdụ ya dị elu karịchasịa nke ụmụ mmadụ niile.
18“Gịnị ọzọ ka Devid ga-agwa gị, nʼihi nsọpụrụ i nyere ohu gị? Nʼihi na ị maara ohu gị nke ọma,
19O Onyenwe anyị, nʼihi okwu gị na dịka ọchịchọ obi gị si dị, i meela ihe a dị ukwuu, meekwa ka ọ mata nkwa ndị a niile dị ukwuu.
20“Onyenwe anyị, ọ dịghị onye dịka gị, ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ọ bụghị gị, dịka anyị nụrụ ya na ntị anyị.