53Ya mụtakwara ndị ikwu Kiriat Jearim, ndị Itra, ndị Put, ndị Shumat na ndị Mishra. Nʼime ndị a ka ndị Zorat na ndị Eshtaol si pụta.
54Salma mụtara ikwu ndị a: Betlehem, ndị Netofa, ndị Atrot Bet Joab, ụfọdụ ndị Manaha na ndị Zoa.
55Ụfọdụ ha bụ ikwu ndị ode akwụkwọ, ndị bi nʼobodo Jabez: ndị Tirait, na ndị Shimea, na ndị Suka. Ndị a niile bụ ndị Ken, ndị sitere nʼagbụrụ Hamat, nna ndị ikwu Rekab.