1Ndị a bụ ụmụ ndị ikom Devid, ndị amụụrụ ya mgbe ọ nọ na Hebrọn. Ọkpara ya bụ Amnọn, nke Ahinoam bụ nwanyị Jezril mụrụ. Nwa ya nke abụọ bụ Daniel, onye nne ya bụ Abigel onye Kamel.
2Nke atọ bụ Absalọm, nwa Maaka, nwa nwanyị Talmai, bụ eze Geshua. Nke anọ bụ Adonaịja, nwa nwoke Hagit
3Nke ise bụ Shefataya, nwa Abital. Nke isii bụ Itream, nke nwunye ya bụ Egla mụrụ.