10Ya onwe ya ga-ewuru m ụlọ ahụ. Ọ ga-abụrụ m nwa, mụ onwe m ga-abụkwara ya nna. Aga m emekwa ka ocheeze alaeze ya nʼIzrel guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.’
11“Ya mere, ugbu a nwa m, ka Onyenwe anyị nọnyere gị mgbe ị ga-ewu ụlọ Onyenwe anyị Chineke gị, dịka o kwuru na ị ga-eme.
12Onyenwe anyị nyekwa gị amamihe na nghọta nke ị ga-eji chịa ezi ọchịchị mgbe ị ghọrọ eze Izrel, ka i si otu a debe iwu Onyenwe anyị Chineke gị.
13Mgbe ahụ, ị ga-enwe ọganihu, ma ọ bụrụ na i lezie anya idebe iwu na ụkpụrụ niile nke Onyenwe anyị nyere Mosis maka Izrel. Dị ike, nwee obi ike. Atụla ụjọ, maọbụ daa mba.
14“Ejisiela m ike chịkọtaa ihe maka ụlọnsọ Onyenwe anyị, narị puku talenti ọlaedo na nde talenti ọlaọcha, na igwe, na bronz, nke a na-apụghị ịgụta ịdị arọ ha, na osisi, na nkume. I nwere ike itinyekwa ihe ndị ọzọ nʼime ha.