1 Ihe E Mere 23

Ụmụ Mosis, onye nke Chineke ka a gụnyekọtara dịka ndị si nʼebo Livayị.

1 Chronicles 23:14 (UKJV) Now concerning Moses the man of God, his sons were named of the tribe of Levi.

12Ụmụ ndị ikom Kohat bụ Amram, Izha, Hebrọn na Uziel. Ha dị ndị ikom anọ.

13Ụmụ ndị ikom Amram bụ, Erọn na Mosis. Erọn ka e kewapụrụ iche, ido ya nsọ ya na ụmụ ya ruo ebighị ebi, maka ido ihe niile kachasị nsọ nsọ, ịchụ aja nʼihu Onyenwe anyị, ije ozi nʼihu ya nakwa ikwupụta ngọzị nʼaha ya ruo ebighị ebi.

14Ụmụ Mosis, onye nke Chineke ka a gụnyekọtara dịka ndị si nʼebo Livayị.

15Ụmụ ndị ikom Mosis bụ, Geshọm na Elieza.

16Ụmụ ndị ikom Geshọm bụ Shubuel, onye mbụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.