19Ụmụ ndị ikom Hebrọn bụ Jereaya onye mbụ, na Amaraya, onye nke abụọ, Jahaziel onye nke atọ, na Jekameam, onye nke anọ.
20Ụmụ ndị ikom Uziel bụ Maịka, onye mbụ, na Ishaya, onye nke abụọ.
21Ụmụ ndị ikom Merari bụ Mahali na Mushi Ụmụ ndị ikom Mali bụ Elieza na Kish
22Elieza nwụrụ na-amụtaghị ụmụ ndị ikom. Ọ bụ naanị ụmụ ndị inyom ka ọ mụtara. Ụmụ nwanne nna ha, ụmụ ndị ikom Kish, lụrụ ha.
23Ụmụ ndị ikom Mushi bụ Mahali, Eda na Jeremot. Ha dị ndị ikom atọ.