22Elieza nwụrụ na-amụtaghị ụmụ ndị ikom. Ọ bụ naanị ụmụ ndị inyom ka ọ mụtara. Ụmụ nwanne nna ha, ụmụ ndị ikom Kish, lụrụ ha.
23Ụmụ ndị ikom Mushi bụ Mahali, Eda na Jeremot. Ha dị ndị ikom atọ.
24Ndị a bụ ụmụ ụmụ Livayị dịka ezinaụlọ ha si dị, ndịisi ezi, dịka e si debanye aha, na dịka e si gụọ ha ọnụ nʼotu nʼotu, ya bụ ndị na-arụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ndị gbara iri afọ abụọ gbagoo.
25Nʼihi na Devid kwuru sị, “Ebe ọ bụ na Onyenwe anyị, Chineke Izrel enyela ndị ya udo, ebe ọ bụkwa na ọ ga-ebi na Jerusalem ruo ebighị ebi.
26Ugbu a, ọ dịkwaghị mkpa ọ dị na ndị Livayị ga na-ebugharị ụlọ ikwu, maọbụ ngwongwo ọbụla nke ije ozi niile ya.”