4Devid sịrị, “Nʼime ndị a, ka iri puku ndị ikom abụọ na anọ bụrụ ndị ga-ahụ maka ọrụ ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, puku ndị ikom isii a bụrụ ndịisi na ndị ikpe,
5puku ndị ikom anọ abụrụ ndị nche ọnụ ụzọ ama, ebe puku ndị ikom anọ ndị ọzọ ga-eji ihe egwu dị iche iche nke m kwadobere maka ito Onyenwe anyị, na-eto ya.”
6Devid kewara ndị Livayị nʼoke, nʼoke dịka ụmụ ndị ikom Livayị si dị: Geshọn, Kohat na Merari.
7E kekwara ikwu Geshọn ụzọ abụọ dịka ụmụ ya si dị, Ladan na Shimei.
8Ndị sitere nʼezinaụlọ Ladan dị ndị ikom atọ: Jehiel, onyeisi ha, Zetam na Juel.