6Devid kewara ndị Livayị nʼoke, nʼoke dịka ụmụ ndị ikom Livayị si dị: Geshọn, Kohat na Merari.
7E kekwara ikwu Geshọn ụzọ abụọ dịka ụmụ ya si dị, Ladan na Shimei.
8Ndị sitere nʼezinaụlọ Ladan dị ndị ikom atọ: Jehiel, onyeisi ha, Zetam na Juel.
9Ụmụ Shimei bụ, Shelomot, Haziel na Haran, ha dị ndị ikom atọ. Ndị a niile bụ ndịisi ezinaụlọ nʼikwu Ladan.
10Ụmụ Shimei bụ, Jahat, Ziza, Jeush na Beriya. Ha dị ndị ikom anọ.