17nke iri abụọ na otu, Jakin nke iri abụọ na abụọ, Gamul
18nke iri abụọ na atọ, Delaya nke iri abụọ na anọ, Maazaya.
19Otu a ka e si keere ha usoro ije ozi ha mgbe ha batara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. E mere ya dị ka ụkpụrụ nna nna ha Erọn nyere ha si dị, dịka Onyenwe anyị, Chineke Izrel si nye ya nʼiwu.
20Ndị a bụkwa ndị ndu a họpụtara nʼebo Livayị: Site nʼụmụ Amram, a họpụtara Shubuel. Site nʼụmụ Shubuel a họpụtara Jehdeia.
21Site nʼụmụ Rehabaya, onye mbụ a họpụtara bụ Ishaya.