19Otu a ka e si keere ha usoro ije ozi ha mgbe ha batara nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị. E mere ya dị ka ụkpụrụ nna nna ha Erọn nyere ha si dị, dịka Onyenwe anyị, Chineke Izrel si nye ya nʼiwu.
20Ndị a bụkwa ndị ndu a họpụtara nʼebo Livayị: Site nʼụmụ Amram, a họpụtara Shubuel. Site nʼụmụ Shubuel a họpụtara Jehdeia.
21Site nʼụmụ Rehabaya, onye mbụ a họpụtara bụ Ishaya.
22Site na ndị Izha a họpụtara Shelomot. Sitekwa nʼụmụ Shelomot a họpụtaara Jahat.
23Site nʼụmụ Hebrọn a họpụtara Jeraya, nwa mbụ ya, Amaraya nwa nke abụọ ya, Jahaziel nwa nke atọ ya na Jekameam nwa nke anọ ya.