1 Ihe E Mere 24

Devid kewara ha dịka usoro ije ozi ha ga-esi dị. Ọ bụ Zadọk onye ikwu Elieza, na Ahimelek onye ikwu Itama nyeere Devid aka ime nke a.

1 Chronicles 24:3 (UKJV) And David distributed them, both Zadok of the sons of Eleazar, and Ahimelech of the sons of Ithamar, according to their offices in their service.

1Ndị a bụ otu e si kenye ụmụ Erọn ọrụ ije ozi ha: Ụmụ ndị ikom Erọn bụ Nadab, na Abihu, na Elieza, na Itama.

2Ma Nadab na Abihu nwụrụ tupu nna ha anwụọ. Ha amụtaghị ụmụ ndị ikom, ya mere, Elieza na Itama jere ozi dịka ndị nchụaja.

3Devid kewara ha dịka usoro ije ozi ha ga-esi dị. Ọ bụ Zadọk onye ikwu Elieza, na Ahimelek onye ikwu Itama nyeere Devid aka ime nke a.

4Ọnụọgụgụ ndị ndu a chọtara nʼikwu Elieza karịrị ọnụọgụgụ ndị ndu a chọtara nʼikwu Itama. Nʼihi ya, e sitere nʼikwu Elieza nweta ndịisi ezinaụlọ iri na isii, sitekwa nʼikwu Itama nweta ndịisi ezinaụlọ asatọ.

5E kere ha na-eleghị onye ọbụla anya nʼihu, site nʼife nza, nʼihi na e nwere ndịisi ozi ebe nsọ, nweekwa ndịisi ozi Chineke nʼetiti ndị ikwu Elieza na Itama.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.