1 Ihe E Mere 26

A họpụtara ndị nche ndị a site nʼikwu Kora na Merari.

1 Chronicles 26:19 (UKJV) These are the divisions of the porters among the sons of Kore, and among the sons of Merari.

17Ya mere, ọ bụ ndị Livayị isii na-eche nche nʼọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ụbọchị niile. Mmadụ anọ na-anọ nʼugwu, anọ na ndịda, abụọ nʼebe a na-achịkọbata ihe.

18Nʼogige nke dị nʼọdịda anyanwụ e nwere ndị nche anọ nʼụzọ, ndị nche abụọ ọzọ nʼime ogige nʼonwe ya.

19A họpụtara ndị nche ndị a site nʼikwu Kora na Merari.

20Ụfọdụ ndị Livayị ka e nyefere ọrụ ilekọta ụlọakụ, na ụlọ a na-echekọta onyinye niile e doro nsọ nke e webatara nʼụlọnsọ ukwu Chineke.

21Ndị agbụrụ Ladan, ndị si nʼikwu Geshọn, ndị bụ ndịisi ezinaụlọ nna ha Ladan, bụ onye Geshọn, bụ Jehieli,

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.