1 Ihe E Mere 26

Nʼogige nke dị nʼọdịda anyanwụ e nwere ndị nche anọ nʼụzọ, ndị nche abụọ ọzọ nʼime ogige nʼonwe ya.

1 Chronicles 26:18 (UKJV) At Parbar westward, four at the causeway, and two at Parbar.

16Shupim na Hosa na-eche ọnụ ụzọ dị nʼọdịda anyanwụ ya na ọnụ ụzọ ama Shaleket nke dị nʼụzọ elu elu. Ndị nche na-esota ndị nche ibe ha.

17Ya mere, ọ bụ ndị Livayị isii na-eche nche nʼọnụ ụzọ dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ụbọchị niile. Mmadụ anọ na-anọ nʼugwu, anọ na ndịda, abụọ nʼebe a na-achịkọbata ihe.

18Nʼogige nke dị nʼọdịda anyanwụ e nwere ndị nche anọ nʼụzọ, ndị nche abụọ ọzọ nʼime ogige nʼonwe ya.

19A họpụtara ndị nche ndị a site nʼikwu Kora na Merari.

20Ụfọdụ ndị Livayị ka e nyefere ọrụ ilekọta ụlọakụ, na ụlọ a na-echekọta onyinye niile e doro nsọ nke e webatara nʼụlọnsọ ukwu Chineke.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.