26Shelomit na ụmụnna ya ka ọ dị nʼaka ilekọta ụlọakụ nke ihe nsọ niile, nke Devid bụ eze, na ndịisi ezinaụlọ niile, ndị bụ ndịisi agha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, na ndịisi agha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndịisi agha ndị ọzọ, doro nsọ.
27Ụfọdụ ihe agha na ihe sitere nʼihe a kwatara nʼagha ka ha doro nsọ maka idozi ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.
28Ya na ihe niile nke Samuel, bụ onye ọhụ ụzọ, na Sọl, nwa Kish na Abna, nwa Nea na Joab, nwa Zeruaya na ihe niile ndị ọzọ e doro nsọ. Ọ bụ nʼaka Shelomit na ụmụnna ya ka ọ dị ilekọta ha.
29Site nʼikwu Izha, Kenaniya, na ụmụ ndị ikom ya ka ozi dịrị pụọ nʼụlọnsọ, dịka ndịisi na ndị ikpe nye ndị Izrel.
30Site na ndị Hebrọn, Hashabaya na ụmụnna ya ndị bụkwa dimkpa, ọnụọgụgụ ha dị otu puku na narị asaa, ka e mere ndịisi ala Izrel dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Jọdan. Ihe niile banyere ọrụ Onyenwe anyị, na ijere eze ozi dị ha nʼaka.