1 Ihe E Mere 26

Site na ndị Hebrọn, Hashabaya na ụmụnna ya ndị bụkwa dimkpa, ọnụọgụgụ ha dị otu puku na narị asaa, ka e mere ndịisi ala Izrel dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Jọdan. Ihe niile banyere ọrụ Onyenwe anyị, na ijere eze ozi dị ha nʼaka.

1 Chronicles 26:30 (UKJV) And of the Hebronites, Hashabiah and his brethren, men of valour, a thousand and seven hundred, were officers among them of Israel on this side Jordan westward in all the business of the LORD, and in the service of the king.

28Ya na ihe niile nke Samuel, bụ onye ọhụ ụzọ, na Sọl, nwa Kish na Abna, nwa Nea na Joab, nwa Zeruaya na ihe niile ndị ọzọ e doro nsọ. Ọ bụ nʼaka Shelomit na ụmụnna ya ka ọ dị ilekọta ha.

29Site nʼikwu Izha, Kenaniya, na ụmụ ndị ikom ya ka ozi dịrị pụọ nʼụlọnsọ, dịka ndịisi na ndị ikpe nye ndị Izrel.

30Site na ndị Hebrọn, Hashabaya na ụmụnna ya ndị bụkwa dimkpa, ọnụọgụgụ ha dị otu puku na narị asaa, ka e mere ndịisi ala Izrel dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ osimiri Jọdan. Ihe niile banyere ọrụ Onyenwe anyị, na ijere eze ozi dị ha nʼaka.

31Jeraya bụ onyendu ndị Hebrọn, dịka akwụkwọ e dekọrọ usoro ọmụmụ si gosi. Nʼihi na nʼafọ nke iri anọ nke ọchịchị eze Devid nʼIzrel, ka e mere nnyocha nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ chọpụta na e nwere ndị dị ike ọrụ nʼetiti ndị Hebrọn. A chọpụtara ndị a nʼobodo Jeza nke dị na Gilead.

32Jeraya nwere ndị ikwu ya, ndị bụ dimkpa, na ndị dị ike ọrụ, ọnụọgụgụ ha dị puku abụọ na narị asaa. Ndị a niile bụkwa ndị ndu ezinaụlọ dị iche iche. Ya mere, Devid, eze Izrel, mere ha ndịisi ebo Ruben, na ebo Gad, na ọkara ebo Manase. Ọrụ ha bụ ilekọta ihe banyere ofufe Chineke na ije ozi niile metụtara eze.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.