4Obed-Edọm nwekwara ụmụ ndị ikom. Ha bụ ndị a: Shemaya, nwa mbụ ya, Jehozabad, osote ya, Joa, nke atọ, Saka, bụ onye nke anọ Netanel, nke ise,
5Amiel, nke isii Isaka, nke asaa na Peuletai, onye bụ onye nke asatọ. Nʼihi na Chineke gọziri Obed-Edọm.
6Shemaya, nwa ya mụtakwara ụmụ ndị ikom, ndị bụ ndị ndu nʼezinaụlọ nna ha, nʼihi na ha bụ dike na dimkpa.
7Ụmụ ndị ikom Shemaya bụ, Otni, Refael, Obed na Elzabad; ụmụnne ya bụ Elihu na Semakaya bụkwa dike na dimkpa.
8Ndị a niile bụ ụmụ ụmụ Obed-Edọm; ha na ụmụ ha ndị ikom, na ndị ikwu ha niile bụ dimkpa ndị nwere ike ịrụ ọrụ ahụ. Ha niile bụ ụmụ ụmụ Obed-Edọm. Ha dị iri isii na abụọ (62) nʼọnụọgụgụ.