19Ishmaya nwa Ọbadaya bụ onyendu ndị Zebụlọn; Jerimot nwa Azriel bụ onyendu ndị Naftalị;
20Hoshea nwa Azazaya bụ onyendu ndị Ifrem; Juel nwa Pedaya bụ onyendu ọkara ebo Manase;
21Ido nwa Zekaraya bụ onyendu ọkara ebo Manase nke ọzọ dị na Gilead; Jaasiel nwa Abna bụ onyendu ndị Benjamin;
22Azarel nwa Jeroham bụ onyendu ndị Dan. Ndị a niile bụ ndị ndu ebo Izrel niile.
23Mgbe Devid gụrụ ụmụ Izrel ọnụ. Ọ gụghị ndị gbara site nʼiri afọ abụọ gbadaa ala, nʼihi na Onyenwe anyị kwere nkwa ime ka ọnụọgụgụ ụmụ Izrel baa ụba dịka kpakpando eluigwe.