23Mgbe Devid gụrụ ụmụ Izrel ọnụ. Ọ gụghị ndị gbara site nʼiri afọ abụọ gbadaa ala, nʼihi na Onyenwe anyị kwere nkwa ime ka ọnụọgụgụ ụmụ Izrel baa ụba dịka kpakpando eluigwe.
24Joab nwa Zeruaya, agụchaghị mmadụ niile ọnụ nʼihi na Chineke tara Izrel ahụhụ nʼihi ịgụ ọnụ a. Ya mere, e denyeghị ọnụọgụgụ mmadụ ole a gụtara nʼakwụkwọ akụkọ Devid eze Izrel nwere.
25Azmavet nwa Adiel, bụ onye na-elekọta ụlọ ịchịkọta ihe eze. Ma Jonatan nwa Ụzaya bụ onyeisi ndị na-ahụ maka ụlọ nchịkọta ihe dị nʼakụkụ ala ahụ niile, ma nʼobodo ukwu, ma nʼobodo nta, ma nʼụlọ nche ndị Izrel niile.
26Ezri nwa Kelub bụ onye na-elekọta ubi eze na ndị na-arụ ọrụ nʼime ya.
27Shimei onye Ramat na-elekọta ubi vaịnị niile. Otu a kwa, Zabdi onye Sifma ka ọ dị nʼaka imepụta mmanya na ichekwa ha.