1 Ihe E Mere 27

Nke a bụ Benaya ahụ bụ dike nʼagha nʼetiti iri ndịisi agha atọ, ma bụrụkwa onye na-achị iri ndị agha atọ ahụ. Amizabad nwa ya ka e tinyere ilekọta nkewa nke atọ a.

1 Chronicles 27:6 (UKJV) This is that Benaiah, who was mighty among the thirty, and above the thirty: and in his course was Ammizabad his son.

4Onyeisi nkewa nke abụọ, maka ọnwa nke abụọ bụ Dodayi, nwa Ahohi bụ onyeisi agha nkewa nke abụọ. Miklot bụ onyendu otu a, ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa a bụ iri puku abụọ na anọ (24,000).

5Onyeisi nkewa nke atọ, maka ọnwa nke atọ bụ Benaya nwa Jehoiada, onye nchụaja. Ọ bụ onyeisi, ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000).

6Nke a bụ Benaya ahụ bụ dike nʼagha nʼetiti iri ndịisi agha atọ, ma bụrụkwa onye na-achị iri ndị agha atọ ahụ. Amizabad nwa ya ka e tinyere ilekọta nkewa nke atọ a.

7Onyeisi nkewa nke anọ, maka ọnwa nke anọ bụ Asahel, nwanne Joab. Zebadaya nwa bụ onye nnọchiri anya ya. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000). Zebadaya nwa ya, nọchiri anya ya mgbe ọ nwụrụ.

8Onyeisi nkewa nke ise, maka ọnwa nke ise bụ Shamhut onye Izha. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000).

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.