12Akụnụba na nsọpụrụ na-esite nʼebe ị nọ abịa. Gị onwe gị na-achịkwa ihe niile. Ọ bụkwa nʼaka gị ka ume na ike dị ibuli ihe niile elu, na inye ihe niile ike.
13Ugbu a, Chineke anyị, anyị na-enye gị ekele na-etokwa aha gị dị ebube.
14“Ma onye ka m bụ, ole ndị kwa ka ụmụ Izrel bụ, na i kweere ka anyị gbasapụ aka anyị nye gị onyinye. Ihe niile anyị nwere sitere nʼaka gị bịa, ha kwa ka anyị na-enyeghachi gị.
15Anyị bụ ndị ọbịa na ndị mbịarambịa nʼihu gị, dịka nna nna anyị ha. Ụbọchị ndụ anyị nʼụwa dị ka onyinyo, nke olileanya na-adịghị nʼime ya.
16O, Onyenwe anyị Chineke anyị, ihe niile ndị a anyị bukọrọ maka iji rụọra gị ụlọnsọ si nʼaka gị bịa. Ha niile bụkwa nke gị.