1 Ihe E Mere 29

Anyị bụ ndị ọbịa na ndị mbịarambịa nʼihu gị, dịka nna nna anyị ha. Ụbọchị ndụ anyị nʼụwa dị ka onyinyo, nke olileanya na-adịghị nʼime ya.

1 Chronicles 29:15 (UKJV) For we are strangers before you, and sojourners, as were all our fathers: our days on the earth are as a shadow, and there is none abiding.

13Ugbu a, Chineke anyị, anyị na-enye gị ekele na-etokwa aha gị dị ebube.

14“Ma onye ka m bụ, ole ndị kwa ka ụmụ Izrel bụ, na i kweere ka anyị gbasapụ aka anyị nye gị onyinye. Ihe niile anyị nwere sitere nʼaka gị bịa, ha kwa ka anyị na-enyeghachi gị.

15Anyị bụ ndị ọbịa na ndị mbịarambịa nʼihu gị, dịka nna nna anyị ha. Ụbọchị ndụ anyị nʼụwa dị ka onyinyo, nke olileanya na-adịghị nʼime ya.

16O, Onyenwe anyị Chineke anyị, ihe niile ndị a anyị bukọrọ maka iji rụọra gị ụlọnsọ si nʼaka gị bịa. Ha niile bụkwa nke gị.

17Amaara m, Chineke m, na ị na-anwale obi, na i na-enwekwa mmasị nʼihe ziri ezi. Ihe ndị niile ka m onwe m nyere site nʼafọ ofufu nakwa obi ziri ezi. Ma ugbu a, ahụla m ọṅụ ndị gị, bụ ndị nọ nʼebe a, ji were afọ ofufu nye gị onyinye ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.