1 Ihe E Mere 5

Ndị Ruben na ndị Gad, na ọkara ebo Manase nwere iri puku mmadụ anọ na anọ na narị asaa na iri isii (44,760) ndị jikeere ije agha, ndị dị ike, ndị a zụrụ iji ọta na mma agha, na ụta ibu agha.

1 Chronicles 5:18 (UKJV) The sons of Reuben, and the Gadites, and half the tribe of Manasseh, of valiant men, men able to bear buckler and sword, and to shoot with bow, and skilful in war, were four and forty thousand seven hundred and threescore, that went out to the war.

16Ndị Gad nwere ebe obibi na Gilead nʼime Bashan, na nʼobodo nta niile gbara ya gburugburu. Ha bikwa nʼebe ahịhịa anụ ụlọ na-ata jupụtara na Sharọn ruo nʼebe oke ala ha kwụsịrị.

17E denyere aha ndị a niile nʼakwụkwọ usoro ọmụmụ nʼoge Jotam bụ eze Juda, na nʼoge Jeroboam bụ eze Izrel.

18Ndị Ruben na ndị Gad, na ọkara ebo Manase nwere iri puku mmadụ anọ na anọ na narị asaa na iri isii (44,760) ndị jikeere ije agha, ndị dị ike, ndị a zụrụ iji ọta na mma agha, na ụta ibu agha.

19Ha busoro ndị Haga, na Jetua, na Nafish na ndị Nodab agha.

20E nyeere ha aka ibuso ha agha, Chineke nyefere ndị Haga na ndị niile na-enyere ha aka nʼaka ha, nʼihi na ha kpọkuru ya nʼoge ọgụ ahụ. Ọ zara ekpere ha nʼihi na ha tụkwasịrị ya obi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.