1 Ihe E Mere 5

Ọ bụ ezie na Juda dị ike karịa ụmụnna ya, bụrụkwa eziokwu na onyendu si na Juda pụta, maọbụ Josef ka e nyere oke ruuru ọkpara.

1 Chronicles 5:2 (UKJV) For Judah prevailed above his brethren, and of him came the chief ruler; but the birthright was Joseph's:)

1Ọkpara Izrel bụ Ruben. Ma nʼihi na ọ merụrụ ihe ndina nna ya site na idinakwuru nwunye nna ya, a napụrụ ya ọnọdụ ọkpara ya were ya nye ụmụ nwanne ya Josef mụtara. Nʼihi ya, akwụkwọ akụkọ usoro ọmụmụ ụmụ Izrel akpọghị Ruben ọkpara.

2Ọ bụ ezie na Juda dị ike karịa ụmụnna ya, bụrụkwa eziokwu na onyendu si na Juda pụta, maọbụ Josef ka e nyere oke ruuru ọkpara.

3Ruben, ọkpara Izrel mụrụ ndị ikom ndị a: Hanok, na Palu, na Hezrọn, na Kami.

4Juel mụrụ Shemaya, nna Gog, Gog mụrụ Shimei.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.