2Ọ bụ ezie na Juda dị ike karịa ụmụnna ya, bụrụkwa eziokwu na onyendu si na Juda pụta, maọbụ Josef ka e nyere oke ruuru ọkpara.
3Ruben, ọkpara Izrel mụrụ ndị ikom ndị a: Hanok, na Palu, na Hezrọn, na Kami.
4Juel mụrụ Shemaya, nna Gog, Gog mụrụ Shimei.
5Shimei mụrụ Maịka, Maịka amụọ Reaya. Reaya amụọ Baal.
6Baal mụrụ Beera, onye Tiglat-Pilesa eze ndị Asịrịa dọtara nʼagha. Beera bụkwa onyendu ndị Ruben.