4Juel mụrụ Shemaya, nna Gog, Gog mụrụ Shimei.
5Shimei mụrụ Maịka, Maịka amụọ Reaya. Reaya amụọ Baal.
6Baal mụrụ Beera, onye Tiglat-Pilesa eze ndị Asịrịa dọtara nʼagha. Beera bụkwa onyendu ndị Ruben.
7Ndị ụmụnna ha dịka agbụrụ niile ha si dị, bụ ndị e depụtara aha ha dịka usoro ọmụmụ ha si dị; Jeiel onyeisi, na Zekaraya,
8na Bela nwa Azaz nwa Shema, nwa Juel. Ha nwere ebe obibi ha site nʼAroea ruo nʼugwu Nebo, rukwaa Baal-Meon.