23Ọkara ebo Manase dị ukwuu nʼọnụọgụgụ; ha nwere ebe obibi ha site nʼala Bashan ruo Baal-Hemon, ya bụ, ruo Senia, ugwu Hemon.
24Ndịisi ikwu ha niile bụ ndị a: Efaa, Ishi, Eliel, Azriel, Jeremaya, Hodavaya na Jadiel. Ndị a niile bụ dimkpa nʼagha, ndị a ma ama na ndịisi ezinaụlọ.
25Ma ha bụ ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Chineke nna nna ha. Kama ha merụrụ onwe ha site nʼife chi niile nke ndị bi nʼala ahụ na mbụ, bụ ndị Chineke lara nʼiyi nʼihu ha.
26Nʼihi nke a, Chineke nke Izrel kpaliri mmụọ Pul, bụ eze Asịrịa (ya bụ Tiglat-Pilesa eze ndị Asịrịa), ka o bilie megide ndị Ruben, ndị Gad na ọkara ebo Manase, dọta ha nʼagha, buru ha gaa Hala, na Hoboa, na Hara na osimiri Gozan, ebe ha nọ ruo taa.