57Ya mere e nyere ụmụ ụmụ Erọn Hebrọn (obodo mgbaba), na Libna, na Jatịa, na Eshtemoa,
58na Hilen, na Debịa,
59na Ashan, na Juta, na Bet-Shemesh, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha.
60Site nʼebo Benjamin e nyere ha obodo Gibiọn, Geba, Alemet, na Anatot, tinyere ebe ịta nri nke anụ ụlọ ha. Obodo ndị a, nke e kere nʼetiti ndị ikwu Kohat, dị iri na otu nʼọnụọgụgụ.
61E fere nza tupu e nye ndị fọdụrụ nʼime ikwu Kohat obodo iri site nʼala ọkara ebo Manase.